OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Na-eme Ka Okwukwe I Nwere n’Okwu Chineke Na-esikwu Ike
Okwu Chineke nwere ike ịgbanwe ndụ anyị. (Hib. 4:12) Ma, naanị ihe ga-eme ka ntụziaka na ndụmọdụ dị na Baịbụl baara anyị uru bụ ma obi sie anyị ike na ọ bụ “okwu Chineke” n’eziokwu. (1 Tesa. 2:13) Olee otú anyị ga-esi na-eme ka okwukwe anyị nwere na Baịbụl na-esikwu ike?
Gụọ ebe ụfọdụ na Baịbụl n’ụbọchị ọ bụla. Ka ị na-agụ ya, gbalịa ka ị hụ ihe ndị gosiri na ọ bụ uche Jehova ka e dere na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, leba anya na ndụmọdụ ndị dị n’akwụkwọ Ilu ma chọpụta otú o si bụrụ na ha ka bara uru taa n’agbanyeghị na ọ dịla anya e dere ha.—Ilu 13:20; 14:30.
Malite ịmụ Baịbụl. Gbalịa ka ị mata nke ọma ihe ndị gosiri na Baịbụl si n’ike mmụọ nsọ Chineke. Gaa n’Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ, n’isiokwu bụ́ “Baịbụl,” gaa n’ebe e dere “Mmụọ Nsọ Duru Ndị Dere Ya.” I nwekwara ike ime ka okwukwe i nwere na ihe e dere na Baịbụl agbanwebeghị sikwuo ike. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịmụ ihe e kwuru n’ebe a kpọrọ Ihe Ndị Ọzọ A Kọwara Nke A3 na Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.
LEENỤ VIDIO BỤ́ IHE MERE ANYỊ JI NWEE OKWUKWE NA . . . . OKWU CHINEKE GA-EMEZU, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
-
Olee otú ihe a chọpụtara n’ahụ́ ụlọ arụsị dị na Kanak, n’Ijipt, si gosi na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu?
-
Olee otú anyị si mara na ihe e kwuru na Baịbụl agbanwebeghị?
-
Olee otú ọdịdị Baịbụl dị ruo taa si mee ka i kweta na ọ bụ Okwu Chineke?—Gụọ Aịzaya 40:8