Jenụwarị 23-29
1 IHE E MERE 4-6
Abụ nke 42 na Ekpere
Okwu Mmeghe (1 nkeji)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Olee Ụdị Onye Ekpere M Na-egosi na M Bụ?”: (Nkeji 10)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 10)
1 Ihe 5:10—Olee otú mmeri e meriri ndị Hega nwere ike isi gbaa anyị ume mgbe nsogbu siri oké ike bịaara anyị? (w05 10/1 9 ¶7)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova, ozi anyị, ma ọ bụ ihe ọzọ?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4) 1 Ihe 6:61-81 (th ihe ọmụmụ nke 2)
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 3) Jiri isiokwu a na-ekwu gbasara ya n’Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta mee ya. Zie ya ozi ọma n’agbanyeghị na o kwuru ihe ndị na-achọghị ịnụ ozi ọma na-ekwukarị. (th ihe ọmụmụ nke 3)
Nletaghachi: (Nkeji 4) Jiri isiokwu a na-ekwu gbasara ya n’Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta malite. Gosi ya vidio bụ́ Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị? Mee ka ị̀ kpọnyeere ya vidio ahụ, unu emeekwa ozugbo ka ùnu elechaala ya. Kwurịtazienụ ihe dị na ya. (th ihe ọmụmụ nke 14)
Ọmụmụ Baịbụl: (Nkeji 5) lff nchịkọta isi nke 08, ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ, na ihe ị ga-agba mbọ mee (th ihe ọmụmụ nke 9)
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Jikere Ugbu A Maka Nsogbu Nwere Ike Ime Ka E Buga Gị Ụlọ Ọgwụ na Mberede”: (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-elekwa vidio. Ọ bụ okenye ga-eme ihe omume a. Nye ọtụtụ ndị ohere ka ha kwuo ihe ndị ha mụtara na vidio ahụ.
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) lff isi nke 35
Okwu Mmechi (Nkeji 3)
Abụ nke 88 na Ekpere