Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Jikere Ugbu A Maka Nsogbu Nwere Ike Ime Ka E Buga Gị Ụlọ Ọgwụ na Mberede

Jikere Ugbu A Maka Nsogbu Nwere Ike Ime Ka E Buga Gị Ụlọ Ọgwụ na Mberede

Gịnị mere anyị kwesịrị iji jikere? Ọrịa ma ọ bụ ihe mberede nwere ike ime ka e buga anyị ụlọ ọgwụ mgbe anyị na-atụghị anya ya. N’ihi ya, tupu ihe gbata gbata emee, gbalịa nweta ihe niile ga-enyere gị aka ka e nwee ike ịgwọ gị nke ọma ma ụdị ihe ahụ mee. I mee ihe a, ọ ga-egosi na i ji ndụ kpọrọ ihe nakwa na ị na-edebe iwu Jehova nyere banyere ọbara.​—Ọrụ 15:28, 29.

Gịnị ka ị ga-eme iji jikere?

  • Kpee ekpere ma lezie anya nke ọma dejupụta kaadị DPA. a Ndị nkwusa e mere baptizim nwere ike isi n’aka nwanna na-ahụ maka akwụkwọ n’ọgbakọ ha nweta kaadị DPA. Ha nwekwara ike isi n’aka ya nwetara ụmụ ha na-erubeghị afọ iri na asatọ kaadị nke a na-akpọ Identity Card (ic)

  • Ọ bụrụ na ị dị ime, gwa ndị okenye ọgbakọ unu ka ha nye gị akwụkwọ a na-akpọ Information for Expectant Mothers (S-401). Akwụkwọ a ga-enyere gị aka ime mkpebi ndị dị mma ma i nwee nsogbu mgbe ị dị ime ma ọ bụ mgbe ị na-amụ nwa

  • Ọ bụrụ na otú a ga-esi agwọ gị ga-eme ka e kwute okwu ọbara ma ọ bụkwanụ ọ bụrụ na a ga-enye gị bed n’ụlọ ọgwụ, mee ka ndị okenye ọgbakọ unu mara n’oge. Gwakwa ndị ụlọ ọgwụ na o nwere Onyeàmà Jehova ga-abịa leta gị

Olee otú ndị okenye nwere ike isi nye aka? Ha nwere ike inyere gị aka mgbe ị na-edejupụta kaadị DPA gị. Ma, ndị okenye agaghị ekpebiri gị otú a ga-esi agwọ gị ma ọ bụ gwawa gị ihe hanwa chere n’okwu mmadụ ga-eji aka ya kpebiere onwe ya. (Rom 14:12; Gal. 6:5) Ị gwa ndị okenye unu na a na-ekwu okwu ịmịnye gị ọbara, ha ga-enyere gị aka kpọtụrụ Kọmitii Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ ozugbo

Olee otú Kọmitii Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ ga-esi nyere gị aka? A zụrụ ụmụnna ndị nọ na kọmitii a ka ha na-enyere ndị ụlọ ọgwụ na ndị na-ahụ maka okwu ikpe aka ịghọta ihe ndị anyị kweere banyere ọbara. Ha na onye na-agwọ gị nwere ike ikwurịta ụzọ ndị ọzọ e nwere ike isi gwọọ gị n’amịnyeghị gị ọbara. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, ha nwekwara ike inyere gị aka inweta dọkịta ga-ekweta ịgwọ gị n’amịnyeghị gị ọbara.

LEENỤ VIDIO BỤ́ IHE GA-ENYERE GỊ AKA IKPEBI OTÚ A GA-ESI AGWỌ GỊ ỌRỊA MA Ọ GBASA ỌBARA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ A:

  • Olee ihe ndị ị mụtara na vidio a ga-enyere gị aka ijikere maka nsogbu nwere ike ime ka a chọwa ịmịnye gị ọbara?

a Isi nke 39 n’akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi ga-enyere gị aka ikpebi otú a ga-esi agwọ gị n’ejighị ọbara.