Febụwarị 24–Mach 2
ILU 2
Abụ nke 35 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. Gịnị Mere I Ji Kwesị Iji Obi Gị Niile Na-amụ Ihe?
(Nkeji 10)
Ọ ga-egosi na i ji eziokwu dị na Baịbụl kpọrọ ihe (Ilu 2:3, 4; w22.08 18 ¶16)
Ọ ga-enyere gị aka ịna-eme mkpebi ndị dị mma (Ilu 2:5-7; w22.10 19 ¶3-4)
Ọ ga-eme ka okwukwe gị sie ike (Ilu 2:11, 12; w16.09 23 ¶2-3)
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Olee otú m ga-esi eme ka ọmụmụ ihe m na-akakwu mma ma na-amụchikwu ya anya?’
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
-
Ilu 2:7—Olee otú Jehova si “bụụrụ ndị kwụsiri ike n’ebe ọ nọ ọta”? (it-1 1211 ¶4)
-
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Ilu 2:1-22 (th ihe ọmụmụ nke 12)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gosi mmadụ otú ọ ga-esi achọta ihe ga-enyere ndị di na nwunye aka na jw.org. (lmd isi nke 1 nọmba nke 3)
5. N’Oge Ọzọ
(Nkeji 3) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Nye ya magazin kwuru banyere ihe masịrị ya n’oge ikpeazụ unu kwurịtara okwu. (lmd isi nke 9 nọmba nke 3)
6. Okwu
(Nkeji 5) lmd ihe ndị ọzọ a kọwara nke A nọmba nke 8—Isiokwu: Di na Nwunye Ekwesịghị Ịna-agba n’Èzí. (th ihe ọmụmụ nke 13)
Abụ nke 96
7. Ọ̀ Na-amasị Gị Ịchọta Akụ̀ Zoro Ezo?
(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Ndị na-eto eto, ọ̀ na-amasị unu ịchọta akụ̀ zoro ezo? Ọ bụrụ na ọ na-amasị unu, Baịbụl na-agwa unu ka unu chọta akụ̀ kacha akụ̀ niile dị n’ụwa, ya bụ, ka unu mụta banyere Chineke. (Ilu 2:4, 5) Otú unu ga-esi achọta ya bụ ịna-ewepụta ohere agụchi Baịbụl anya, nakwa ịna-eme nchọnchọ banyere ihe ndị unu gụrụ. Ime ihe a ga-atọ unu ụtọ, unu ga-amụtakwa ọtụtụ ihe.
-
Olee ajụjụ ndị i nwere ike ịjụ onwe gị mgbe ị na-agụ Baịbụl? (w24.02 32 ¶2-3)
-
Olee ihe ndị ga-enyere gị aka ịchọta azịza ajụjụ ndị ahụ?
Vidio ndị a kpọrọ Mụta Ihe n’Aka Ndị Enyi Jehova nwere ike inyere gị aka ịmụta otú ị ga-esi na-echebara ihe ndị ị na-agụ na Baịbụl echiche.
Kpọnye VIDIO Bụ́ Mụta Ihe n’Aka Ndị Enyi Jehova—Ebel.
Gụọnụ Jenesis 4:2-4 na Ndị Hibru 11:4. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:
-
Olee otú Ebel si gosi na ọ bụ enyi Jehova?
-
Olee otú Ebel si mee ka okwukwe o nwere na Jehova sie ike?
-
Olee otú ị ga-esi eme ka okwukwe gị sie ike?
8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) rr isi nke 22 ¶10-22