Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jenụwarị 20-26

ABỤ ỌMA 138-139

Jenụwarị 20-26

Abụ nke 93 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Ekwela Ka Ụjọ Mee Ka Ị Ghara Ịza Ajụjụ n’Ọmụmụ Ihe

(Nkeji 10)

Anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-eto Jehova (Ọma 138:1)

Ọ bụrụ na obi na-awụnye gị n’afọ mgbe ọ bụla ị chọrọ ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe, rịọ Jehova ka o nyere gị aka (Ọma 138:3)

E nwere ihe dị mma ụjọ ị na-atụ na-egosi (Ọma 138:6; w19.01 10 ¶10)

IHE GA-ENYERE GỊ AKA: Ọ bụrụ na i mee ka azịza gị dị nkenke, ọ ga-eme ka ụjọ na-atụ gị belata.​—w23.04 21 ¶7.

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ọma 139:21, 22—Ọ̀ bụ iwu na Ndị Kraịst ga-agbaghara onye ọ bụla? (it-1 862 ¶4)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. (lmd isi nke 2 nọmba nke 3)

5. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs

(Nkeji 4) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Gwa mmadụ ka ị mụwara ya Baịbụl, gosikwa ya otú anyị na ndị mmadụ si amụ ya. (lmd isi nke 10 nọmba nke 3)

6. Okwu

(Nkeji 5) ijwyp isiokwu nke 105​—Isiokwu: Olee Otú M Ga-esi Akwụsị Ime Ihere? (th ihe ọmụmụ nke 16)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 59

7. Ị Ga-emeli nke Ọma n’Ozi Gị n’Agbanyeghị na Ị Bụ Onye Ihere

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Ị̀ ga-asị na ị bụ onye ihere? Ị̀ na-achọkarị ka a ghara ịma na ị nọ ya? Obi ọ̀ na-awụnye gị n’afọ ma ị chọọ ịgwa ndị ọzọ okwu? Mgbe ụfọdụ, ihere nwere ike ime ka mmadụ ghara ime ihe ndị ọ chọrọ ime. Ma, ọtụtụ ndị ha na ihere na-alụ agbaala mbọ na-akọrọ ndị ọzọ banyere Baịbụl, ozi ha ana-agakwa nke ọma. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka ha?

Kpọnye VIDIO Bụ́ M Na-eme Ike M Niile n’Ozi Jehova n’Agbanyeghị na M Bụ Onye Ihere. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

  • Olee uru Nwanna Nwaanyị Lee ritere maka na o mere ihe mama nnukwu ya gwara ya, nke bụ́ ka o ‘jiri ike ya niile jeere Jehova ozi’?

Ihe Baịbụl kwuru gosiri na ọ ga-abụ na Mosis, Jeremaya, na Timoti bụcha ndị ihere. (Ọpụ. 3:11; 4:10; Jere. 1:6-8; 1 Tim. 4:12) Ma, ha niile kpara ike n’ozi Jehova n’ihi na Jehova nọnyeere ha. (Ọpụ. 4:12; Jere. 20:11; 2 Tim. 1:6-8)

Gụọnụ Aịzaya 43:1, 2. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

  • Olee nkwa Jehova kwere ndị na-efe ya?

Olee otú Jehova nwere ike isi nyere ndị ihere aka n’oge anyị a ka ha nwee ike ịna-eme nke ọma n’ozi ha?

Kpọnye VIDIO Bụ́ Vidio Si na Vidio Bụ́ Otú Ime Baptizim Ga-esi Eme Ka Ị Na-enwekwu Obi Ụtọ. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

  • Olee otú Nwanna Nwaanyị Jackson sirila chọpụta na Jehova na-enye ya ike ma na-akwado ya n’ozi ya?

  • Olee otú ozi ọma nwere ike isi nyere onye na-eme ihere aka?

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 151 na Ekpere