Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jenụwarị 6-12

ABỤ ỌMA 127-134

Jenụwarị 6-12

Abụ nke 134 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Ndị Nne na Nna, Na-elekọtanụ Ọmarịcha Onyinye E Nyere Unu

(Nkeji 10)

Obi kwesịrị isi ndị nne na nna ike na Jehova ga-enyere ha aka igboro ndị ezinụlọ ha mkpa ha (Ọma 127:1, 2)

Ụmụ bụ ọmarịcha onyinye si n’aka Jehova (Ọma 127:3; w21.08 5 ¶9)

Ọ bụ ụdị mkpa nwa gị nke ọ bụla nwere ga-ekpebi aka ị ga-eji azụ ya (Ọma 127:4; w19.12 27 ¶20)

Obi na-atọ Jehova ezigbo ụtọ ma ndị nne na nna tụkwasị ya obi ma na-eme ihe niile ha nwere ike ime iji na-elekọta ụmụ ha

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ọma 128:3​—Gịnị mere ọbụ abụ a ji jiri ụmụ tụnyere ome osisi oliv? (it-1 543)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. (lmd isi nke 1 nọmba nke 3)

5. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Onye ahụ kwuru ihe gosiri na o kweere nkụzi na-esighị na Baịbụl. (lmd isi nke 5 nọmba nke 4)

6. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs

(Nkeji 5) lff isi nke 16 nọmba nke 4-5. Gị na onye ị na-amụrụ ihe kwurịta ndokwa i mere ka a na-amụrụ ya ihe n’oge ị na-agaghị anọ ya. (lmd isi nke 10 nọmba nke 4)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 13

7. Ndị Nne na Nna, Ùnu Na-eji Àgwà Ọma Unu Akụziri Ụmụ Unu Ihe?

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Nzukọ Jehova ewepụtala ọtụtụ ihe iji nyere ndị nne na nna aka ịkụziri ụmụ ha banyere Jehova. Ma, otu n’ime ihe ndị kacha mma ndị nne na nna kwesịrị iji na-akụziri ụmụ ha ihe bụ àgwà ọma hanwa na-akpa.​—Diut. 6:5-9.

Jizọs ji àgwà ọma ọ na-akpa kụziere ndị na-eso ụzọ ya ihe.

Gụọnụ Jọn 13:13-15. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

  • Gịnị ka i chere mere otú a Jizọs si jiri ihe o mere kụziere ndị na-eso ụzọ ya ihe ji daba adaba?

Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ndị ị na-akụziri ụmụ gị, obi ga-esi ha ike na ihe ndị ị na-agwa ha mee ga-abara ha uru. Àgwà ọma ị na-akpa ga-emekwa ka ụmụ gị jiri ihe ị na-akụziri ha kpọrọ ihe, o nwekwara ike ime ka ha na-ege gị ntị.

Kpọnye VIDIO Bụ́ Anyị Si n’Omume Anyị Kụziere Ụmụ Anyị Ihe. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

  • Olee ihe ndị dị mkpa Nwanna Garcia na nwunye ya kụziiri ụmụ ha nwaanyị?

  • Olee otú vidio a si mee ka i kpebisikwuo ike ịna-akpa àgwà ọma ụmụ gị ga-amụta ihe na ya?

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 73 na Ekpere