Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | LUK 10-11

Ihe Atụ Onye Sameria Bụ́ Ezigbo Onye Agbata Obi

Ihe Atụ Onye Sameria Bụ́ Ezigbo Onye Agbata Obi

10:25-37

Jizọs mere ihe atụ a mgbe ọ na-aza onye jụrụ ya, sị: “Ònye n’ezie bụ onye agbata obi m?” (Luk 10:25-29) Jizọs maara na “ụdị mmadụ niile” ga-abata n’ọgbakọ Ndị Kraịst, ma ndị Sameria ma ndị Jentaịl. (Jọn 12:32) Ihe atụ a mere ka ndị na-eso ụzọ Jizọs mata na ha kwesịrị ime ihe ọ bụla ha nwere ike ime iji gosi ụdị mmadụ ọ bụla na ha hụrụ ha n’anya.

JỤGODỊ ONWE GỊ:

  • ‘Olee otú m si ele ụmụnna anyị ndị mụ na ha na-esighị otu ebe anya?’

  • ‘Ndị mụ na ha na-anọkarị hà bụ naanị ndị ihe na-adabara mụ na ha?’

  • ‘M̀ na-enwe mmasị imeta ụmụnna anyị ndị mụ na ha na-esighị otu ebe enyi?’ (2 Kọr. 6:13)

M ga-achọ ịgwa ______________________ ka . . .

  •  mụ na ya rụọ n’ozi ọma

  •  ọ bịa n’ụlọ m rie ihe

  •  ọ bịa n’ụlọ anyị n’oge ọzọ anyị ga-enwe Ofufe Ezinụlọ