Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | LUK 6-7

Na-emere Ndị Ọzọ Ihe Ọma

Na-emere Ndị Ọzọ Ihe Ọma

6:38

Onye na-emesapụ aka na-eji obi ụtọ jiri oge ya, ike ya na ihe ndị ọzọ o nwere na-enyere ndị ọzọ aka ma na-agbakwa ha ume.

  • Okwu Grik a sụgharịrị “na-enyenụ ihe” gosiri na ọ bụ ihe e kwesịrị imere na-aga.

  • Ọ bụrụ na anyị ana-enye ndị ọzọ ihe, ha ga-awụnye n’apata ụkwụ anyị “ọ̀tụ̀tụ̀ dị mma, nke a bịara aka, yọkọta ọnụ, nke jubigakwara ókè.” O nwere ike ịbụ na okwu a na-akọwa ihe ndị ahịa ụfọdụ na-eme n’oge ochie. Ha na-awụjụrụ mmadụ ihe ọ zụrụ n’ebe ọ fụkọtara n’uwe elu ya