Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | LUK 12-13

“Unu Dị Oké Ọnụ Ahịa Karịa Ọtụtụ Nza”

“Unu Dị Oké Ọnụ Ahịa Karịa Ọtụtụ Nza”

12:6, 7

Gịnị ka Jizọs na-ekwu gbasara ya tupu ya ekwuo ihe dị na Luk 12:6, 7? N’amaokwu nke anọ, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ghara ịtụ ụjọ ndị nwere ike imegide ha ma ọ bụ gbuo ha. Jizọs ji ihe a o kwuru na-eme ka ndị na-eso ụzọ ya dị njikere maka mkpagbu ndị ga-abịara ha n’ọdịnihu. O ji ya mesie ha obi ike na Jehova ji onye nke ọ bụla n’ime ha kpọrọ ihe nakwa na ọ gaghị ekwe ka ihe ọ bụla mebie adịm ná mma ha na ya.

Olee otú anyị nwere ike isi na-emetara ndị a na-akpagbu ebere ka Jehova?

Olee ebe anyị ga-aga gụọ ihe ndị kacha ọhụrụ gbasara Ndịàmà Jehova a tụrụ mkpọrọ n’ihi okwukwe ha?

Ka ọ dị ugbu a, ụmụnna nwoke na nwaanyị ole nọ n’ụlọ mkpọrọ?