Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe I Nwere Ike Ikwu

Ihe I Nwere Ike Ikwu

ỤLỌ NCHE

Ajụjụ: Ebe Baịbụl bụ Okwu Chineke, í cheghị na mbọ ọ bula a gbara ka ọ ghara ịdịgide ga-akụ afọ n’ala?

Amaokwu Baịbụl: Aịza. 40:8

Otú a ga-esi enye ya: Isiokwu ndị kọwara isiokwu Ụlọ Nche a kwuru otú Baịbụl si dịrị ruo taa n’agbanyeghị mbọ a gbarala ka ọ ghara ịdịgide.

ỤLỌ NCHE (peeji nke 16)

Ajụjụ: M ga-achọ ịma ihe i chere gbasara ajụjụ a. [Gụpụtara ya ajụjụ dị́ na peeji nke 16.] Ụfọdụ ndị na-ekwu na ọ bụ mmadụ malitere okpukpe. Ndị ọzọ chere na ọ bụ Chineke malitere ya iji nyere ndị mmadụ aka ka ha bịaruo ya nso. Gịnị ka i chere?

Amaokwu Baịbụl: Jems 1:27

Otú a ga-esi enye ya: Isiokwu a ga-akọwakwuru gị ihe Baịbụl kwuru gbasara ikpere Chineke. M ga-achọ ịbịa n’oge ọzọ ka anyị tụleekwuo ya.

OZI ỌMA SI N’AKA CHINEKE!

Ajụjụ: Ọtụtụ ndị na-eche na o nweghị oké ihe amụma ndị dị́ na Baịbụl pụtara. Ole n’ime ihe ndị a anyị ga-agụ ugbu a ka ị na-anụ ma ọ bụ na-ahụ ka ha na-emezu?

Amaokwu Baịbụl: 2 Tim. 3:1-5

Otú a ga-esi enye ya: Broshọ a kọwara otú ihe ndị e kwuru n’amaokwu Baịbụl ndị a si bụrụ ndị na-efe Chineke ozi ọma. [Gosi ya ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ dị́ n’isi nke 1, ajụjụ nke 2.]

DEE OTÚ ỌZỌ Ị GA-ESI JIRI OTU N’IME AKWỤKWỌ NDỊ A ZIE OZI ỌMA

Jiri aro ndị a dị́ ebe a dee otú ọzọ ị ga-achọ isi jiri akwụkwọ ndị a zie ozi ọma.