Ònye Kacha Mkpa ná Ndụ Gị?
O nwere ike ịbụ na onye dere Abụ Ọma nke 83 si n’ezinụlọ Esaf. Esaf bụ onye Livaị ya na Devid dịkọrọ ndụ. E dere abụ ọma a mgbe mba ndị gbara ndị Chineke gburugburu na-ebuso ha agha.
-
Ekpere onye dere abụ ọma a kpere gosiri na ọ chọghị ọdịmma nke ya, kama, ihe kacha ya mkpa bụ aha Jehova na otú o si bụrụ ya ruru eru ịchị ihe niile
-
Taa, a ka na-emegide ndị Chineke n’ụzọ dị iche iche. A ga-ebuli aha Jehova elu ma anyị guzosie ike
-
Jehova chọrọ ka anyị mara aha ya
-
Otú anyị si ebi ndụ kwesịrị igosi na ọ bụ Jehova kacha mkpa ná ndụ anyị