Julaị 11-17
ABỤ ỌMA 69-73
Abụ nke 92 na Ekpere
Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Ofufe Jehova Na-anụ Ndị Ya Ọkụ n’Obi”: (Nkeji 10)
Ọma 69:9—Anyị kwesịrị igosi na anyị na-anụ ọkụ n’obi n’ofufe Jehova (w10 12/15 7-11 ¶2-17)
Ọma 71:17, 18—Ndị torola eto kwesịrị inyere ndị na-eto eto aka ka ha na-anụ ọkụ n’obi (w14 1/15 23-24 ¶4-10)
Ọma 72:3, 12, 14, 16-19—Otú anyị si na-anụ ọkụ n’obi ga-eme ka anyị na-agwa ndị ọzọ ihe Alaeze Chineke ga-emere ụmụ mmadụ (w15 10/1 16 ¶3; w10 8/15 32 ¶19-20)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)
Ọma 69:4, 21—Olee otú ihe dị́ n’amaokwu ndị a si mezuo n’isi Mesaya? (w11 8/15 11 ¶17; w11 8/15 15 ¶15)
Ọma 73:24—Olee otú Jehova si edu ndị ohu ya ka ha nweta ihe ùgwù? (w13 2/15 25-26 ¶3-4)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova?
Olee ihe ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a nke ị ga-eji zie ndị mmadụ ozi ọma?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Ọma 73:1-28
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Ozi Ụlọ n’Ụlọ: (Nkeji 2 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Isiokwu Ụlọ Nche Nke 4 2016. Gwa onye ahụ ihe unu ga-atụle n’oge ọzọ.
Nletaghachi: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Isiokwu Ụlọ Nche Nke 4 2016
Ọmụmụ Baịbụl: (Nkeji 6 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) fg isi nke 5 ¶3-4
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Ì Nwere Ike Iji Otu Afọ Nwalee Ya?”: (Nkeji 15) Ná nkenke, burunụ ụzọ tụlee isiokwu a na isiokwu bụ́ “Otú Ọsụ Ụzọ Ga-esi Na-arụzu Awa Ya.” Kpọnyezie vidio bụ́ Jiri Ndụ Gị Mee Ihe Ga-abara Gị Uru Ruo Mgbe Ebighị Ebi, tụleekwanụ ya. (Gaa na Tiivi anyị, pịa HỌRỌ VIDIO Ị CHỌRỌ, pịa NDỊ NA-ETO ETO.)
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) ia isi nke 19 ¶17-31, igbe dị na peeji nke 170, na nke dị na peeji nke 171
Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)
Abụ nke 123 na Ekpere