MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA | MEE KA OZI ỌMA NA-ATỌKWU GỊ ỤTỌ
Na-akụzi Ihe Otú Ọ Ga-eru n’Obi
Irubere Chineke isi na-esi n’obi. (Ilu 3:1) N’ihi ya, anyị kụziwe ihe, anyị kwesịrị ịgbalị kụzie ya otú ọ ga-eru ndị mmadụ n’obi. Olee otú anyị ga-esi eme ya?
Ihe ị ga-eme abụghị naanị ịkụziri mmadụ eziokwu Baịbụl. Kama, kụziekwara ya otú ọ ga-esi na-eme ihe ndị ahụ eme na otú ya na Jehova ga-esi dị ná mma. Mee ka ọ ghọta otú iwu Chineke si egosi na Chineke nwere ịhụnanya, na ọ dị mma, nakwa na ọ bụ onye ezi omume. Jiri ajụjụ chọpụta otú obi dị ya maka ihe ndị ọ na-amụta. Nyere ya aka ịmata uru ndị ọ ga-erite ma ọ gbanwee echiche ma ọ bụ àgwà na-adịghị mma o nwere. Ị chọpụta na onye ị na-amụrụ ihe ji obi ya niile hụ Jehova n’anya, obi ga na-atọkwu gị ụtọ.
LEENỤ VIDIO BỤ́ NA-ENWE ỌṄỤ A NA-ENWE N’IHI IME NDỊ NA-ESO ỤZỌ—NA-EME KA OTÚ I SI EZI OZI ỌMA KA MMA—NA-AKỤZI IHE OTÚ Ọ GA-ERU N’OBI, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
-
Gịnị mere Linda ji jụọ Joy, sị: “Ì chebakwuuru ihe anyị mụrụ na Mọnde echiche?”
-
Olee otú Linda si nyere Joy aka ịmata na iwu ndị Jehova nyere na-egosi na ọ hụrụ ya n’anya?
-
Olee otú Linda si nyere Joy aka ịmata otú ọ ga-esi gosi na ọ hụrụ Chineke n’anya?