Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Na-emeso Ụmụ Nwaanyị Mere Okenye Dị Ka Ndị Nne, Na-emesokwa Ụmụ Agbọghọ Dị Ka Ụmụnne Gị Ndị Nwaanyị

Na-emeso Ụmụ Nwaanyị Mere Okenye Dị Ka Ndị Nne, Na-emesokwa Ụmụ Agbọghọ Dị Ka Ụmụnne Gị Ndị Nwaanyị

Akwụkwọ Nsọ gwara anyị ka anyị na-emeso ụmụnna ndị katarala ahụ́ ka ndị nne anyị na nna anyị, na-emesokwa ndị nke na-akatabeghị ahụ́ ka ụmụnne anyị. (Gụọ 1 Timoti 5:1, 2.) Ụmụnna ndị nwoke karịchaa kwesịrị ịna-akwanyere ụmụnna nwaanyị ùgwù.

Nwanna nwoke ekwesịghị ịna-achụ nwaanyị ma ọ bụ na-eme ihe ọzọ ga-eme ka ahụ́ ghara iru nwanna nwaanyị ala n’ebe ọ nọ. (Job 31:1) Nwanna nwoke ekwesịghị ịna-emeso nwanna nwaanyị ihe ka ọ̀ chọrọ ịlụ ya ebe ọ makwanụ na ọ gaghị alụ ya.

Ndị okenye kwesịrị ịna-ege ụmụnna nwaanyị ntị ma ha meda obi jụọ ajụjụ ma ọ bụ kwuo ihe o nwere ike ịdị mkpa ka e lebara anya. Ndị okenye, karịchaa, kwesịrị ịna-eche banyere ndị na-enweghị di ga na-echebe ha.—Rut 2:8, 9.

LEENỤ VIDIO BỤ́ NỌGIDE NA-AHỤ ỤMỤNNA NDỊ A N’ANYA—NDỊ DI HA NWỤRỤ ANWỤ NA ỤMỤ NA-ENWEGHỊ NNA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee otú ụmụnna si gosi na ha hụrụ Nwanna Nwaanyị Myint n’anya nke ukwuu?

  • Olee otú ịhụnanya ụmụnna anyị gosiri Nwanna Nwaanyị Myint na ụmụ ya si mee ka e too Jehova n’obodo ha?

  • Olee otú ịhụnanya ụmụnna anyị gosiri Nwanna Nwaanyị Myint si nyere ụmụ ya aka?

Olee ụzọ ụfọdụ i nwere ike isi gosi na i ji ụmụnna nwaanyị nọ n’ọgbakọ unu kpọrọ ihe?