OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Unu Echegbula Onwe Unu”
N’Izrel oge ochie, Jehova nyeere ndị ogbenye aka. Olee ụzọ ụfọdụ o si enyere ndị ohu ya dara ogbenye aka taa?
-
Ọ kụzierela ha otú ha kwesịrị isi na-ele ego anya.—Luk 12:15; 1 Tim. 6:6-8
-
O nyerela ha aka ịmata na ha bara uru.—Job 34:19
-
Ọ kụzierela ha ịna-arụsi ọrụ ike na ịna-ezere àgwà ndị ga-akpatara ha nsogbu.—Ilu 14:23; 20:1; 2 Kọr. 7:1
-
Ọ kpọbatala ha ná nzukọ ya ebe ha nwere ụmụnna hụrụ ha n’anya.—Jọn 13:35; 1 Jọn 3:17, 18
-
O meela ka ha nwee olileanya.—Ọma 9:18; Aịza. 65:21-23
N’agbanyeghị otú ihe nwere ike isi siere anyị ike, anyị ekwesịghị ịna-echegbu onwe anyị. (Aịza. 30:15) Jehova ga na-egboro anyị mkpa anyị ma ọ bụrụhaala na anyị eburu ụzọ na-achọ Alaeze ya.—Mat. 6:31-33.
LEENỤ VIDIO BỤ́ KA ỊHỤNANYA GỊ GHARA ỊDA, Ọ BỤRỤGODỊ NA . . . Ị DARA OGBENYE—KONGO, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
-
Olee otú ụmụnna ndị bi nso n’ebe a na-enwe mgbakọ ukwu sirila lee ụmụnna ndị si ebe dị anya bịa mgbakọ ọbịa?
-
Olee ihe vidio a na-akụziri anyị banyere otú Jehova si hụ ndị ogbenye n’anya?
-
Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ka Jehova n’agbanyeghị otú akpa anyị hà?