Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA | MEE KA OZI ỌMA NA-ATỌKWU GỊ ỤTỌ

Na-eme Ebere

Na-eme Ebere

Onye na-eme ebere na-aghọta otú obi dị ndị ọzọ, ihe ha na-eche, ihe ndị ha ji kpọrọ ihe, na ihe ndị dị ha mkpa. Anyị metere ndị ọzọ ebere, ha ga-ama. Ọ bụrụ na ọ na-agụsi anyị agụụ ike inyere ndị ọzọ aka, ọ ga-eme ka anyị na-emere ha ebere. Anyị metere ndị anyị na-ezi ozi ọma ebere, ọ ga-egosi na anyị na-eṅomi ịhụnanya Jehova. Ọ ga-emekwa ka ha bịa fewe ya.—Fil. 2:4.

Ihe na-egosi ma ànyị na-emetere ndị ọzọ ebere bụ otú anyị si ege ha ntị, otú anyị si agwa ha okwu, otú anyị si akpa àgwà, na otú anyị si emegharị ahụ́ anyị na ihu anyị. Anyị kwesịrị igosi ha na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi. Anyị kwesịkwara ịchọpụta ihe ndị na-amasị ha, ihe ndị ha kweere, na ọnọdụ ha. Anyị ga na-akụziri ha ihe ma na-enyere ha aka. Ma, anyị agaghị amanye ha ịgbanwe. Ma ọ bụrụ na ha anabata enyemaka anyị, ọ na-eme ka anyị na-enwekwu ọṅụ n’ozi anyị.

LEENỤ VIDIO BỤ́ NA-ENWE ỌṄỤ A NA-ENWE N’IHI IME NDỊ NA-ESO ỤZỌ—NA-EME KA OTÚ I SI EZI OZI ỌMA KA MMA—NA-EMETERE NDỊ Ị NA-AMỤRỤ IHE EBERE, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee otú Linda si metere Joy ebere mgbe Joy na-abịaghị n’oge?

  • Olee otú Linda si metere Joy ebere mgbe ike gwụrụ Joy ịmụ ihe?

  • Anyị metere ndị mmadụ ebere, ọ na-eme ka ha bịa fewe Jehova

    Olee otú Linda si metere Joy ebere mgbe Joy sị na ya amachaghị otú e si ahazị ihe nke ọma?