AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
Ị̀ Na-esi n’Ihe Ndị I Mejọrọ Amụta Ihe?
[Kpọnye vidio Ihe Akwụkwọ 1 Ndị Eze Na-ekwu.]
E meere Adọnaịja ebere mgbe ọ kpachara nkata otú ọ ga-esi abụ eze (1 Eze 1:5, 52, 53; it-2 987 ¶4)
Adọnaịja amụtaghị ihe n’ihe ahụ o mejọrọ. Ọ takwara ahụhụ maka ya (1 Eze 2:15-17, 22, 23; it-1 49)
Onye maara ihe ga-esi n’ihe ndị o mejọrọ mụta ihe. Ma, ọ na-akacha mma ka o si n’ihe ndị ọzọ mejọrọ mụta ihe.—1 Kọr. 10:11.