OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ | KPEBIE IHE NDỊ Ị GA-EME N’AFỌ IJE OZI NA-ABỊANỤ
Tinye Akwụkwọ Ịga Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze
Ọ dịghị mkpa ka i chere ruo mgbe ihe niile dịchaara gị mma tupu gị ekpebie ịga Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze. Ihe kacha mkpa a chọrọ gị n’aka bụ iji ofufe Jehova kpọrọ ihe na ịdị njikere ịrụ ọrụ ọ bụla nzukọ Jehova sịrị gị rụọ.—Aịza. 6:8.
LEENỤ VIDIO BỤ́ JIRI OKWUKWE NA-EME ỌTỤTỤ IHE N’ỌRỤ ONYENWE ANYỊ—TINYE AKWỤKWỌ ỊGA ỤLỌ AKWỤKWỌ MAKA NDỊ NA-EKWUSA OZI ỌMA ALAEZE, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
-
Gịnị mere o ji na-eme Gabriel obi abụọ itinye akwụkwọ ịga ụlọ akwụkwọ ahụ, oleekwa otú ịtụgharị uche n’ihe dị ná Ndị Filipaị 4:13 si nyere ya aka?