Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebe Eze Solomọn gara ịhụ otú ọrụ si na-aga n’ụlọ nsọ ahụ

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Ha Ji Ike Ha Niile na Obi Ha Niile Rụọ Ya

Ha Ji Ike Ha Niile na Obi Ha Niile Rụọ Ya

Solomọn ji ihe ndị kacha mma e ji arụ ụlọ rụọ ụlọ nsọ Chineke (1 Eze 5:6, 17; w11 2/1 15)

Ọtụtụ ndị sokwa rụọ ọrụ ahụ (1 Eze 5:13-16; it-1 424; it-2 1077 ¶1)

Solomọn na ndị Izrel rụsiri ọrụ ike ruo afọ asaa iji rụchaa ụlọ nsọ ahụ (1 Eze 6:38; lee ihe e sere n’ihu akwụkwọ a)

Solomọn na ndị Izrel rụụrụ Jehova ụlọ nsọ mara ezigbo mma, nke ga-eme ka a na-eto ya. Ihe mere ka ha nwee ike ime ihe a bụ n’ihi na ha ji obi ha niile rụọ ọrụ ahụ. Ma, ọ dị mwute na ọgbọ ndị nke nọchiri ha ejighịzi obi ha niile na-efe Jehova. Ha hapụrụ ụlọ nsọ ahụ, ya emebie, e mechaakwa bibie ya.

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Olee ihe ndị m na-eme ka m nwee ike ịnọgide jiri obi m niile na-efe Jehova?’