Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Ihe Ogidi Abụọ Ahụ Na-akụziri Anyị

Ihe Ogidi Abụọ Ahụ Na-akụziri Anyị

A rụrụ ogidi abụọ buru ibu n’ebe a ga-esi na-abata n’ụlọ nsọ ebe ndị mmadụ ga na-ahụ ha (1 Eze 7:15, 16; w13 12/1 13 ¶3)

A kpọrọ ogidi ndị ahụ aha nwere ezigbo ihe ha pụtara (1 Eze 7:21; it-1 348)

Jehova ga-enyere ndị ya aka mee ka ụlọ nsọ ahụ “kwụrụ chịm” ma ọ bụrụhaala na ha atụkwasị ya obi (Ihe e dere n’ala ala peeji banyere Jekin ná 1 Eze 7:21; Ọma 127:1)

O nwere ike ịbụ na Jehova nyeere anyị aka imeri ọtụtụ nsogbu ka anyị nwee ike ịbata n’ọgbakọ ya. Ma, anyị ga-anọgide na-atụkwasị ya obi iji mee ka ‘okwukwe anyị sie ike.’​—1 Kọr. 16:13.

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Olee otú m si egosi na m na-atụkwasị Jehova obi?’