Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Mkpọsa Pụrụ Iche A Ga-eme n’Ọnwa Septemba Maka Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl

Mkpọsa Pụrụ Iche A Ga-eme n’Ọnwa Septemba Maka Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl

N’ọnwa Septemba, anyị ga-agbasi mbọ ike jiri broshọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi malitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl. Ndị nkwusa nwere ike ịhọrọ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka ma nye awa iri atọ n’ọnwa ahụ. Olee otú anyị ga-esi eme mkpọsa a pụrụ iche?

  • Ná Mkparịta Ụka nke Mbụ: Jiri ihe e dere n’azụ broshọ ahụ mee ka onye ahụ nwee mmasị, gosikwa ya otú anyị si eji broshọ ahụ amụrụ ndị mmadụ Baịbụl. Echefula ndị i ziri ozi ọma n’oge gara aga gosiri mmasị, ma ndị ị na-agara nletaghachi. Ọ bụrụgodị na ha achọbughị ịmụ Baịbụl na mbụ, ụzọ ọhụrụ anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl na broshọ a nwere ike ịmasị ha. Anyị ekwesịghị idowe broshọ ahụ n’ụlọ ndị mmadụ ma ọ bụrụ na ha anọghị ya ma ọ bụkwanụ tinye ya n’akwụkwọ ozi zigara ndị na-egosibeghị na ha nwere mmasị. Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ nwere ike ịhazi ka ọgbakọ nwekwuo nzukọ ozi ubi n’ọnwa a karịa otú ha na-enwebu.

  • N’Oge Ndị Ọzọ: Ọ bụrụ na ọgbakọ unu na-eji ihe a na-akwagharị akwagharị edowe akwụkwọ anyị, tinyenụ broshọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi na ya. Gwa ndị gosiri mmasị na anyị na-ejikwa broshọ ahụ amụrụ ndị mmadụ Baịbụl n’anaghị ha ego. Jiri obere oge gosi ha otú anyị si eji ya amụ Baịbụl ozugbo ahụ ma ọ bụkwanụ unu ekwuo mgbe ọzọ unu ga-eme ya. Onye nlekọta ije ozi nwere ike ịhazi ka ndị nkwusa ruru eru gaa n’ụlọ ahịa na n’ụlọ ọrụ ndị dị n’ókèala unu malitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl. I nwekwara ike ịgwa ndị ọrụ ibe gị ma ọ bụ ndị ọzọ ị na-ahụ mgbe ị na-anọghị n’ozi ka unu mụwa Baịbụl.

Jizọs nyere anyị iwu ka anyị mee “ndị na-eso ụzọ,” ‘na-ezikwa ha’ ihe. (Mat. 28:​19, 20) Ekpere anyị bụ ka mkpọsa a pụrụ iche nyere anyị aka iji akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi mee ihe a Jizọs sịrị anyị mee.