AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
Uru Amamihe Bara
Solomọn rịọrọ Jehova ka o nye ya amamihe (1 Eze 3:7-9; w11 12/15 8 ¶4-6)
Ihe Solomọn rịọrọ masịrị Jehova (1 Eze 3:10-13)
Obi ruru ndị Izrel ala mgbe Solomọn na-achị n’ihi na Solomọn ji amamihe Chineke na-enye kpọrọ ihe (1 Eze 4:25)
Onye maara ihe na-eleru ihe anya nke ọma, gbalịa ghọta ihe ahụ nke ọma ma jiri ihe ndị ọ chọpụtara mee mkpebi dị mma. Amamihe dị mma karịa ọlaedo. (Ilu 16:16) Otú anyị ga-esi enweta amamihe bụ ịrịọ Chineke ka o nye anyị ya, ịna-atụ egwu Chineke, ịdị obi umeala, na ịmụ Okwu ya nke ọma.