OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ | KPEBIE IHE NDỊ Ị GA-EME N’AFỌ IJE OZI NA-ABỊANỤ
Kwaga Ebe A Chọkwuru Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma
Ị ga-enwerịrị okwukwe ka i nwee ike ịhapụ ebe maara gị ahụ́ kwaga n’ebe ọhụrụ ị na-amaghị iji jekwuoro Jehova ozi. (Hib. 11:8-10) Ọ bụrụ na ị na-atụle ma ị̀ ga-aga n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma, kọtụrụ ya ndị okenye ọgbakọ unu. Olee ihe ụfọdụ i nwere ike ime iji mata ihe ọ ga-efu gị ịga jewe ozi n’ebe ọzọ? Oleekwa ihe ga-enyere gị aka ịhọrọ ebe ị ga-aga? Gụọ ihe akwụkwọ anyị dị iche iche kwurula banyere ịga jewe ozi n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma. Gwa ndị ọzọ merela ụdị ihe a ozi ha na-aga nke ọma ka ha tụọrọ gị aro. (Ilu 15:22) Rịọ Jehova n’ekpere ka o duzie gị. (Jems 1:5) Mata banyere ebe ị chọrọ ịkwaga nke ọma. Ọ bụrụkwa na ọ ga-ekwe mee, gaa ebe ahụ nọọ karịa abalị ole na ole tupu gị ekpebiwe ma ị̀ ga-aga ebe ahụ.
LEENỤ VIDIO BỤ́ JIRI OKWUKWE NA-EME ỌTỤTỤ IHE N’ỌRỤ ONYENWE ANYỊ—KWAGA EBE A CHỌKWURU NDỊ NA-EKWUSA OZI ỌMA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
-
Olee nsogbu ndị Gabriel meriri, oleekwa ihe nyeere ya aka imeri ha?