OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Otú E Si Eji Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta Ezi Ozi Ọma
Ụmụnna anyị na-agba ezigbo mbọ iji kwadebe ihe ndị na-agba n’Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta. Ọtụtụ ụmụnna anyị achọpụtakwala na ọ na-abara ha ezigbo uru n’ókèala ha. Ma, ebe ọ bụ na otú ihe si dị n’otu ebe nwere ike ịdị iche n’otú ọ dị n’ebe ọzọ, ụmụnna anyị nweere onwe ha isi n’ụzọ ọzọ zie ozi ọma, ma ọ bụ jiri isiokwu ọzọ ga-amasị ndị obodo ha zie ha ozi ọma. Ma, anyị niile kwesịrị iso ntụziaka ọ bụla e nyere maka ime mkpọsa pụrụ iche. Ihe bụ́ mkpa anyị bụ ikwusa ozi ọma Alaeze Jizọs nyere anyị iwu ka anyị kwụsaa.—Mat. 24:14.
Ndị na-eme ihe omume ụmụ akwụkwọ kwesịrị iji isiokwu a na-ekwu gbasara ya n’Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta mee ihe omume ha (dị ka ihe atụ, n’ọnwa Julaị na Ọgọst, isiokwu a na-ekwu gbasara ya bụ: Ihe Chineke bu n’obi kee mmadụ). Ma, ha nweere onwe ha ịgbanwe ajụjụ, amaokwu Baịbụl, ajụjụ a ga-aza n’oge ọzọ, ma ọ bụ otú a ga-esi eme ihe ngosi ahụ ka ọ daba n’otú ihe si dị n’ókèala ha. Ihe a anọchiela ihe e kwuru n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ nke ọnwa Jun, afọ 2020, peeji ya nke 8.