Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Ị̀ Na-ekwe Ka Onyinye Gị Fuo Gị Ihe?

Ị̀ Na-ekwe Ka Onyinye Gị Fuo Gị Ihe?

A gwara Devid ka ọ rụọ ebe ịchụàjà n’ebe Arọna onye Jebus na-anọ azọcha ọka (2 Sam. 24:18)

Arọna ji obi ya niile chọọ inye Devid ala ahụ na anụmanụ ọ ga-eji chụọ àjà (2 Sam. 24:21-23)

Devid ekweghị achụrụ Jehova àjà n’emefughị ihe ọ bụla (2 Sam. 24:24, 25; it-1 146)

Obi na-atọ Jehova ụtọ ma anyị si n’ala ala obi anyị jiri oge anyị, ike anyị, na ihe ndị anyị nwere na-akwado ozi Alaeze ya. (w12 1/15 18 ¶8) Olee ihe ndị i nwere ike ikpebi ime iji mee ka “àjà otuto” ị na-achụrụ Jehova bukwuo ibu?​—Hib. 13:15.