OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ị Ga-emeli Ka Ezinụlọ Unu Na-enwekwu Obi Ụtọ
Jehova chọrọ ka ezinụlọ niile na-enwe obi ụtọ. (Ọma 127:3-5; Ekli. 9:9; 11:9) Ma, nsogbu ụwa na ihe ndị ezinụlọ anyị na-anaghị emeta nwere ike ime ka anyị ghara ịna-enwe obi ụtọ. Gịnị ka onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ga-eme ka obi ụtọ na-adịkwu n’ezinụlọ?
Di kwesịrị ịna-akwanyere nwunye ya ùgwù. (1 Pita 3:7) O kwesịrị ịna-ewepụta oge ya na nwunye ya ga-eji na-anọ. O kwesịghị ịtụwa anya ka nwunye ya mee ihe ndị ọ na-agaghị emeli, kama, ọ ga na-ekele ya maka mbọ ọ na-agbara ya na ezinụlọ ha. O kwesịkwara ịna-egosi ya na ọ hụrụ ya n’anya ma na-eto ya.—Ilu 31:28, 31.
Nwunye kwesịrị ịna-achọ ụzọ ndị ọ ga-esi na-akwado di ya. (Ilu 31:12) O kwesịrị ịna-edo onwe ya n’okpuru di ya ma na-akwado ya. (Kọl. 3:18) O kwesịkwara ịna-eji olu ọma agwa di ya okwu, na-ekwukwa okwu ọma banyere ya.—Ilu 31:26.
Ndị nne na nna kwesịrị ịna-ewepụta oge ha na ụmụ ha ga-eji na-anọ. (Diut. 6:6, 7) Ha ga na-agwa ụmụ ha na ha hụrụ ha n’anya. (Mat. 3:17) Ha dọwa ụmụ ha aka ná ntị, ha kwesịrị iji ịhụnanya na nghọta na-eme ya.—Efe. 6:4.
Ụmụ kwesịrị ịna-asọpụrụ ndị mụrụ ha ma na-erubere ha isi. (Ilu 23:22) Ha ga na-akọrọ ndị mụrụ ha obi ha. Ha kwesịkwara ịnabata aka ná ntị nne na nna ha na-adọ ha ma na-akwanyere ha ùgwù.—Ilu 19:20.
LEENỤ VIDIO BỤ́ NA-ENWE ỌṄỤ N’EZINỤLỌ GỊ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ A:
Gịnị ka onye nke ọ bụla mere iji hụ na ezinụlọ ha na-enwe obi ụtọ?