OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Mkpọsa Pụrụ Iche A Ga-eme na Septemba Iji Gwa Ndị Mmadụ Gbasara Alaeze Chineke
N’ọnwa Septemba, anyị ga-agba mbọ pụrụ iche iji mee ka ndị mmadụ mata na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-eme ka nsogbu ụmụ mmadụ kwụsị. (Mat. 24:14) Olee otú i nwere ike isi soro mee mkpọsa a? N’ọnwa ahụ, gụọrọ ndị niile i nwere ike inweta amaokwu Baịbụl kwuru gbasara Alaeze Chineke. Ọ bụrụ na mmadụ egosi na o nwere mmasị, nye ya Ụlọ Nche ọhaneze Nke 2 2020. Gaghachizie na nke ya ngwa ngwa ma gbalịa iji broshọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Ndị niile ga-arụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa Septemba nwere ike ikpebi inye awa iri na ise ma ọ bụ awa iri atọ n’ọnwa ahụ.
N’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-egwepịa ọchịchị niile na-emegide ya. (Dan. 2:44; 1 Kọr. 15:24, 25) Ka anyị niile jiri ohere a pụrụ iche anyị nwere gosi nke ọma na anyị na-akwado Jehova na Alaeze ya.