AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
Nehemaya Chọrọ Ijere Ndị Ọzọ Ozi, Ọ Bụghị Ka Ndị Ọzọ Jeere Ya Ozi
Nehemaya ejighị ikike o nwere chọwa ihe ga-abara naanị onwe ya uru (Nehe. 5:14, 15, 17, 18; w02 11/1 27 ¶3)
Ihe Nehemaya mere abụghị naanị ilekọta ọrụ ịrụghachi mgbidi Jeruselem. Kama, o sokwa rụọ ya (Nehe. 5:16; w16.09 6 ¶16)
Nehemaya rịọrọ Jehova ka o cheta ya n’ihi ọrụ ọ rụrụ maka na o ji obi ya niile hụ ndị Chineke n’anya (Nehe. 5:19; w00 2/1 32)
Ọ bụ eziokwu na Nehemaya bụ gọvanọ, ma ọ chọghị ka a na-akwanyere ya ùgwù pụrụ iche. Ndị nwere ihe ùgwù na ọrụ ha na-arụ n’ọgbakọ kwesịrị ịmụta ihe n’aka Nehemaya.
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Ihe ka mụ mkpa ọ̀ bụ ihe m ga-emere ndị ọzọ kama ịbụ ihe hanwa ga-emere m?’