AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
Àgwà Ọma Ezra Mere Ka E Too Jehova
Ezra kwere ka Okwu Chineke ruo ya n’obi ma mee ka ọ na-akpa àgwà ọma (Ezra 7:10; w00 10/1 14 ¶8)
Ndị ọzọ si n’aka Ezra chọpụta amamihe si n’aka Chineke (Ezra 7:25; si 75 ¶5)
Obi siri Ezra ike na Jehova ga-eduzi ya ma chebe ya ebe ọ bụ na o weturu onwe ya ala n’ihu Chineke (Ezra 8:21-23; it-1 1158 ¶4)
Eze nyere Ezra ọrụ ndị dị ezigbo mkpa ọ ga-arụ n’ihi na Ezra gosiri na o nwere amamihe si n’aka Chineke. Anyịnwa nwekwara ike ime ka e too Jehova n’ihi àgwà ọma anyị otú ahụ Ezra mere.
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Ndị na-amaghị Chineke hà na-akwanyere m ùgwù n’ihi àgwà ọma m?’