Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebe Ndị E Si Nweta Foto: Peeji nke 3: ikpe Kokkinakis v. Greece: Droit réservé

Malite n’aka ekpe n’elu: ikpe West Virginia State Board of Education v. Barnette; ikpe Kokkinakis v. Greece. Malite n’aka nri n’ala: ikpe Taganrog LRO and Others v. Russia; ikpe Cha and Others v. South Korea

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

‘Ịgbachitere Ozi Ọma na Iji Ihe Iwu Kwuru Akwado Izisa Ozi Ọma’

‘Ịgbachitere Ozi Ọma na Iji Ihe Iwu Kwuru Akwado Izisa Ozi Ọma’

Mgbe ndị mmegide gbalịrị ime ka ndị Izrel kwụsị ịrụghachi ụlọ nsọ Chineke, ndị Izrel gbalịrị jiri ihe iwu kwuru gosi na ha kwesịrị ịrụghachi ya. (Ezra 5:11-16) Otú ahụ ka Ndị Kraịst na-emekwa taa. Ha na-agba mbọ agbachitere ozi ọma ma jiri ihe iwu kwuru na-akwado izisa ozi ọma. (Fil. 1:7) Ọ bụ ya mere e ji hiwe Ngalaba Okwu Iwu n’isi ụlọ ọrụ anyị n’afọ 1936. Taa, ngalaba a na-ahazi otú a ga-esi na-agbachitere ọrụ Alaeze Chineke n’ụwa niile. Olee otú ngalaba a sirila nye aka n’ịkwado ọrụ Alaeze Chineke? Oleekwa otú o sirila baara ndị Chineke uru?

LEENỤ VIDIO BỤ́ ỌRỤ NGALABA OKWU IWU DỊ N’ISI ỤLỌ ỌRỤ ANYỊ NA-ARỤ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee ikpe gbasara Ndịàmà Jehova e kperela?

  • Ikpe ole ka anyị meririla n’ụlọikpe? Nye ihe atụ

  • Olee ihe onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ime iji ‘gbachitere ozi ọma ma jiri ihe iwu kwuru na-akwado izisa ozi ọma’?

  • Anyị gaa na jw.org, olee ebe anyị ga-ahụ ikpe ndị gbasara ụmụnna anyị nakwa ebe e depụtara aha Ndịàmà Jehova a tụrụ mkpọrọ n’ihi okwukwe ha?