AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
Ì Chere na Ị Karịala Ịrụ Ọrụ E Ji Ike Ọkpụkpụ Aka Arụ?
Nnukwu onye nchụàjà na ụmụnne ya echeghị na ha akarịala iso arụzi mgbidi Jeruselem (Nehe. 3:1)
Ụfọdụ ndị a ma ama “ewedaghị onwe ha ala” soro rụọ ọrụ ahụ (Nehe. 3:5; w06 2/1 10 ¶1)
Ụmụ nwaanyị na-atụ egwu Chineke ji obi ha niile soro rụọ ọrụ ahụ siri ezigbo ike (Nehe. 3:12; w19.10 23 ¶11)
Ọtụtụ ọrụ a na-arụ n’ọgbakọ bụ ọrụ ndị e ji ike ọkpụkpụ aka arụ ma ọ bụ ọrụ ndị e weere ka ọrụ ndị dị ala, ndị mmadụ anaghịkwa ahụkarị anyị mgbe anyị na-arụ ha.—w04 8/1 18 ¶16.
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Olee otú obi na-adị m ịrụ ụdị ọrụ ndị a n’ihi ozi ọma?’—1 Kọr. 9:23.