OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Alaeze Chineke Achịala Otu Narị Afọ, Chịrịkwa Na-aga
Ndị niile chọrọ iketa Alaeze Chineke kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka ha mụta ihe ndị dị́ mkpa banyere Alaeze ahụ, ha kwesịkwara ịma ihe ndị Alaeze ahụ merela. Ihe mere ha ji kwesị ịma ihe ndị ahụ bụ na ọ ga-eme ka obi sie ha ike na Alaeze Chineke achịwala. Ọ ga-emekwa ka izi ndị ọzọ ozi ọma Alaeze ahụ na-anụ ha ọkụ n’obi. (Ọma 45:1; 49:3) Kirie vidio bụ́ Alaeze Chineke Achịala Otu Narị Afọ, Chịrịkwa Na-aga. Ka ị na-ekiri ya, gbalịa chọpụta azịza ajụjụ ndị a:
-
Olee otú fim a na-akpọ “Photo-Drama of Creation,” ya bụ, “Foto Ihe Nkiri nke Okike,” si baara ndị niile kiriri ya uru?
-
Olee otú e si jiri redio zie ndị mmadụ ozi ọma?
-
Olee ụzọ ndị ọzọ e si zie ndị mmadụ ozi ọma n’oge ahụ, oleekwa ihe sí na ha pụta?
-
Olee otú otú e si na-azụ anyị maka ikwusa ozi ọma si na-akakwu mma kemgbe ọtụtụ afọ?
-
Olee ọzụzụ e nyere ndị gara Ụlọ Akwụkwọ Gilied?
-
Olee otú mgbakọ dị iche iche ndị Jehova na-aga si enye aka akụziri ha ihe?
-
Gịnị mere i ji kweta na Alaeze Chineke na-achị?
-
Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị na-akwado Alaeze Chineke?