Jun 27–Julaị 3
ABỤ ỌMA 52-59
Abụ nke 38 na Ekpere
Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Tụkwasị Jehova Ibu Arọ Gị”: (Nkeji 10)
Ọma 55:2, 4, 5, 16-18—E nwere ọtụtụ ihe nyere Devid nsogbu n’obi mgbe ọ nọ ndụ (w06 6/1 11 ¶3; w96 4/1 27 ¶2)
Ọma 55:12-14—Nwa Devid na ezigbo enyi ya kpaara ya nkata ọjọọ (w96 4/1 29 ¶6)
Ọma 55:22—Devid kwuru ihe gosiri na obi siri ya ike na Jehova ga-enyere ya aka (w06 6/1 11 ¶4; w99 3/15 22-23)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)
Ọma 56:8—Gịnị ka okwu bụ́ “gbanye anya mmiri m n’ime karama akpụkpọ gị” pụtara? (w09 6/1 28 ¶5; w08 10/1 26 ¶3)
Ọma 59:1, 2—Olee ihe anyị mụtara n’aka Devid banyere ekpere? (w08 3/15 14 ¶13)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova?
Olee ihe ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a nke ị ga-eji zie ndị mmadụ ozi ọma?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Ọma 52:1–53:6
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Ozi Ụlọ n’Ụlọ: (Nkeji 2 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Nye onye nwe ụlọ otu traktị. Gosi ya ihe e sere n’azụ traktị ahụ nke ga-ebuga ya na jw.org/ig.
Nletaghachi: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) A ga-eme ihe ngosi otú a ga-esi gaa nletaghachi na nke onye ahụ natara traktị.
Ọmụmụ Baịbụl: (Nkeji 6 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) fg isi nke 3 ¶2-3—Ná mmechi, kpọnyetụrụ ya vidio dị na jw.org/ig bụ́ Olee Ihe Ndị Gosiri na Baịbụl Na-ekwu Eziokwu?
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Mkpa ọgbakọ: (Nkeji 7)
“Chineke Bụ Onye Na-enyere M Aka”: (Nkeji 8) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ị jụọ ajụjụ nke ọ bụla, nye ọtụtụ ụmụnna ohere ka ha kwuo obi ha. Ihe ha ga-ekwu nwere ike ịgba mmadụ niile ume. (Rom 1:12) Gbaa ụmụnna ume ka ha na-eji Akwụkwọ Nchọnchọ achọta ihe ga-enyere ha aka ma nsogbu bịara ha.
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) ia isi nke 18 ¶14-21, na igbe dị na peeji nke 161
Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)
Abụ nke 121 na Ekpere