OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma —Jiri Vidio Na-akụzi Ihe
IHE MERE O JI DỊ MKPA:
Ndị mmadụ na-ele vidio, ihe ha na-ahụ na ihe ha na-anụ na vidio ahụ na-erukarị ha n’obi. Uche ha niile na-adị n’ihe ahụ ha na-ele, ọ na-esikwa ike ha echefuo ihe ha lere. Jehova ji ihe a na-ahụ anya kụziere ndị ohu ya ihe n’oge ochie.—Ọrụ 10:9-16; Mkpu. 1:1.
E nwere vidio ndị kọwakwuru ihe dị́ n’isi nke abụọ na isi nke atọ nke broshọ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke. Ha bụ: Chineke Ò Nwere Aha?, Uche Ònye Ka E Dere na Baịbụl?, na Olee Ihe Ndị Gosiri na Baịbụl Na-ekwu Eziokwu? E nwekwara vidio ndị nke na-agba ndị mmadụ ume ka anyị na ha mụwa Baịbụl ma ọ bụ ka ha bịawa ọmụmụ ihe anyị. Ha bụ: Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị?, Olee Otú Anyị na Ndị Mmadụ Si Amụ Baịbụl?, na Gịnị Ka A Na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze? Anyị nwekwara ike iji vidio anyị ndị ọzọ toro ogologo kụziwere mmadụ ihe dị́ na Baịbụl.—km 5/13 3.
OTÚ Ị GA-ESI EME YA:
-
Danloduo vidio ị chọrọ iji akụziri mmadụ ihe
-
Kwadebe otu ajụjụ ma ọ bụ abụọ vidio ahụ zara
-
Gị na ya lekọọ vidio ahụ ọnụ
-
Tụleenụ ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ dị́ na ya
IHE Ị GA-EME:
-
Gosi mmadụ otú ọ ga-esi jiri adres Ịntanet anyị dị na traktị nweta vidio bụ́ Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị?, ma ọ bụ gị egosi ya ihe e sere n’azụ traktị ahụ nke ga-ebuga ya n’ebe vidio ahụ dị
-
Kpọnyere mmadụ vidio bụ́ Olee Ihe Ndị Gosiri na Baịbụl Na-ekwu Eziokwu? Nye ya broshọ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke, gosikwa ya isi ihe ndị dị́ n’isi nke 3