Tụkwasị Jehova Obi ma Na-eme Ihe Ọma
“Ewela iwe n’ihi ndị na-eme ihe ọjọọ”
-
Ekwela ka otú ihe si na-agaziri ndị ajọ omume ugbu a mee ka ị daa mbà. Lekwasị anya n’otú Jehova si na-agọzi gị nakwa n’ozi ị na-ejere ya
“Tụkwasị Jehova obi, na-emekwa ihe ọma”
-
Ka obi sie gị ike na Jehova ga-enyere gị aka mgbe ọ bụla ihe na-echu gị ụra. Ọ ga-eme ka i guzosie ike
-
Na-agachi ozi ọma anya
‘Ka ihe Jehova na-atọ gị ụtọ nke ukwuu’
-
Wepụta oge ị ga-eji na-agụ Baịbụl ma na-atụgharị uche ka i nwee ike ịmatakwu Jehova
“Nyefee ụzọ gị n’aka Jehova”
-
Ka obi sie gị ezigbo ike na Jehova ga-enyere gị aka imeri ụdị nsogbu ọ bụla nwere ike ịbịara gị
-
Gbaa mbọ mee ihe ziri ezi mgbe a na-akpagbu gị ma ọ bụkwanụ mgbe e boro gị ebubo
“Gbachie nkịtị n’ihu Jehova, cheresie ya ike”
-
Etinyela aka n’ihe ndị nwere ike ime ka ị ghara ịna-enwe ọṅụ ma ọ bụ ihe ndị nwere ike ime ka gị na Chineke ghara ịdị ná mma
“Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa”
-
Dịrị umeala n’obi, nweekwa ndidi ruo mgbe Jehova ga-akwụsị ahụhụ ị na-ata
-
Na-enyere ụmụnna gị aka. Na-echetara ndị nke dara mbà na ụwa ọhụrụ nke ga-abịa n’oge na-adịghị anya ga-akwụsị nsogbu niile