Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | LUK 1

Ṅomie Ịdị Umeala n’Obi Meri

Ṅomie Ịdị Umeala n’Obi Meri

Jehova họọrọ Meri ka ọ rụọ ọrụ pụrụ iche ọ na-enweghị onye rụtụrụla ya ma ọ bụkwanụ onye ga-arụ ụdị ya ọzọ, n’ihi na ọ ma na ọ dị njikere ime uche ya.

1:38, 46-55

Olee otú ihe Meri kwuru si gosi na . . .

  • ọ dị umeala n’obi?

  • o nwere okwukwe siri ike?

  • ọ ma Akwụkwọ Nsọ nke ọma?

  • o nwere ekele maka ihe ọma Jehova meere ya?