OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ndị Nne na Nna, Nyerenụ Ụmụ Unu Aka Ka Ha Jiri Ife Chineke Kpọrọ Ihe
Ọ na-agụ ndị nne na nna na-atụ egwu Chineke agụụ ịhụ na ụmụ ha ji ife Chineke kpọrọ ihe. Ndị nne na nna nwere ike inyere ụmụ ha aka iji ife Chineke kpọrọ ihe ma ha bido mgbe ha ka dị obere kụziwere ha Okwu Chineke. (Diut. 6:7; Ilu 22:6) Ò nwere ihe ọ ga-efu ha iji mee ya? Ee. Ma uru ọ na-aba karịrị akarị.—3 Jọn 4.
Ndị mụrụ ụmụ nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe n’aka Josef na Meri. Ha “na-aga Jeruselem site n’afọ ruo n’afọ maka ememme ngabiga,” n’agbanyeghị na ime njem ahụ abụghị obere ọrụ, ọ na-efukwa ego. (Luk 2:41) O doro anya na ha ji ife Chineke kpọrọ ihe karịa ihe ọ bụla ọzọ n’ezinụlọ ha. Taa, ndị nne na nna nwekwara ike inyere ụmụ ha aka iji ofufe Chineke kpọrọ ihe ma ha jiri okwu ha na omume ha na-akụziri ha ihe n’ohere ọ bụla dapụtaranụ.—Ọma 127:3-5.
LEENỤ VIDIO BỤ́ HA JI OHERE Ọ BỤLA DAPỤTAARA HA MEE IHE BARA URU, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
-
Olee otú Nwanna Jon Schiller na Sharon nwunye ya si bute ihe gbasara ofufe Chineke ụzọ mgbe ha ka na-azụ ụmụ?
-
Gịnị mere aka nne na nna ji zụọ otu nwa ha na-ekwesịghị ịbụ aka ha ga-eji azụ nke ọzọ?
-
Olee otú ndị nne na nna ga-esi akwadebe ụmụ ha imeri ọnwụnwa?
-
Olee ihe ndị nzukọ Jehova mepụtara e ji akụziri ụmụaka ihe i jirila nyere ụmụ gị aka?