Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Gbaara Nsogbu Na-esi n’Ebe A Na-emeta Ndị Enyi n’Ịntanet Ọsọ

Gbaara Nsogbu Na-esi n’Ebe A Na-emeta Ndị Enyi n’Ịntanet Ọsọ

IHE MERE O JI DỊ MKPA: Ebe a na-emeta ndị enyi n’Ịntanet nwere uru, nwee ọghọm. Ụfọdụ Ndị Kraịst kpebiri ịna-eji ya eso ndị enyi na ndị ezinụlọ ha na-akparịta, ma ndị ọzọ kpebiri na ha agaghị eji ya eme ihe ọ bụla. Ekwensu chọrọ ka anyị jiri ya na-eme ihe na-abaghị uru, si otú ahụ mebie aha ọma anyị na adịm ná mma anyị na Chineke. Anyị nwere ike ime ka Jizọs ma anyị jiri ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru chọpụta ma zere ihe ndị nwere ike ime ka anyị banye ná nsogbu n’ebe a na-emeta ndị enyi n’Ịntanet.—Luk 4:4, 8, 12.

NSOGBU NDỊ ANYỊ GA-AGBARA ỌSỌ:

  • Ịnọ ogologo oge n’ebe a na-emeta ndị enyi n’Ịntanet. Ịnọ ọtụtụ awa n’ebe ahụ nwere ike ime ka anyị tụfuo oge anyị gaara eji mee ihe ndị gbasara ofufe Jehova

    Ihe Baịbụl kwuru: Efe. 5:15, 16; Fil. 1:10

  • Ile ihe ndị dị njọ. Ịnọ ebe ahụ na-ele foto ndị na-adịghị mma nwere ike ime ka mmadụ na-ele ndị gba ọtọ ma ọ bụkwanụ mee ka ọ kwaa iko. Ịgụ ihe ndị si n’ezi ofufe dapụ dere nwekwara ike ime ka okwukwe mmadụ gharazie isi ike

    Ihe Baịbụl kwuru: Mat. 5:28; Fil. 4:8

  • Ide ihe na-adịghị mma na itinye foto na-ekwesịghị ekwesị. Ebe ọ bụ na obi dị aghụghọ, mmadụ nwere ike ide ihe na-adịghị mma ma ọ bụ tinye foto ndị na-ekwesịghị ekwesị n’ebe ahụ. Ime otú a nwere ike imebi aha onye ahụ ma ọ bụ mee ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ

    Ihe Baịbụl kwuru: Rom 14:13; Efe. 4:29

LEENỤ VIDIO BỤ́ KPACHARA ANYA N’EBE A NA-EMETA NDỊ ENYI N’ỊNTANET, KWUOKWANỤ IHE A GA-EME IJI ZERE ỌNỌDỤ NDỊ A: