Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Na-esochi Nzọụkwụ Kraịst Anya

Na-esochi Nzọụkwụ Kraịst Anya

Jizọs mere ihe anyị kwesịrị iṅomi karịchaa mgbe anyị nwere nsogbu ma ọ bụ mgbe a na-akpagbu anyị. (1 Pita 2:21-23) Ma mgbe a na-akparị ya, ma mgbe a na-ata ya ahụhụ, o megwaraghị. (Mak 15:29-32) Gịnị nyeere ya aka idi ihe ndị a? O kpebiri ime uche Jehova. (Jọn 6:38) O lekwasịrị anya ‘n’ọṅụ e debere n’ihu ya.’—Hib. 12:2.

Olee ihe anyị na-eme mgbe a na-ata anyị ahụhụ n’ihi ihe anyị kweere? Ezigbo ndị Kraịst anaghị ‘eji ihe ọjọọ akwụ ụgwọ ihe ọjọọ.’ (Rom 12:14, 17) Ọ bụrụ na anyị ana-edi ọnwụnwa ka Kraịst, obi ga-adị anyị ụtọ n’ihi na ihe anyị na-eme dị Chineke mma.—Mat. 5:10-12; 1 Pita 4:12-14.

LEENỤ VIDIO BỤ́ Ọ BỤ AHA JEHOVA KACHA MKPA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee otú Nwanna Nwaanyị Pötzinger * si jiri oge ya mee ihe bara uru mgbe e tinyere ya n’ụlọ mkpọrọ ebe ọ nọ naanị ya?

  • Olee ihe ndị Nwanna Pötzinger na nwunye ya diri mgbe ha nọ n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche?

  • Gịnị nyeere ha aka idi ha?

Ị tawa ahụhụ, sochie nzọụkwụ Kraịst anya

^ para. 6 E nwekwara ike ide ya Poetzinger.