Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Lezie Anya Mgbe Ị Na-ahọrọ Ihe Ndị I Ji Atụrụ Ndụ

Lezie Anya Mgbe Ị Na-ahọrọ Ihe Ndị I Ji Atụrụ Ndụ

Olee ihe mere anyị kwesịrị iji lezie anya mgbe anyị na-ahọrọ ihe ndị anyị ji atụrụ ndụ? Ọ bụ n’ihi na ihe dị na fim anyị na-ele, egwú anyị na-ege, ebe anyị na-aga n’Ịntanet, akwụkwọ anyị na-agụ, ma ọ bụ egwuregwu vidio anyị na-egwu bụ ihe ga na-ejupụtazi anyị n’obi. Nke anyị họọrọ nwere ike ime ka anyị na-akpa àgwà ọma ma ọ bụ nke ọjọọ. Ọ dị mwute na ihe juru n’ọtụtụ n’ime ihe ndị e ji atụrụ ndụ taa bụ ihe ndị Jehova kpọrọ asị. (Ọma 11:5; Gal. 5:​19-21) Ọ bụ ya mere Baịbụl ji na-agwa anyị ka anyị nọgide na-eche banyere ihe ndị ga-ewetara Jehova otuto.​—Fil. 4:8.

LEENỤ VIDIO BỤ́ OLEE ỤDỊ IHE M GA-EJI ATỤRỤ NDỤ? ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee otú egwuregwu ịlụ ọgụ a na-eme n’ámá egwuregwu ndị Rom n’oge ochie si yie ụfọdụ ihe e ji atụrụ ndụ taa?

  • Olee otú ndị nọ n’ọgbakọ nwere ike isi nyere ndị na-eto eto aka ịhọrọ ntụrụndụ dị mma?

  • Olee otú Ndị Rom 12:9 ga-esi nyere anyị aka ma anyị chọwa ịhọrọ ihe anyị ga-eji atụrụ ndụ?

  • Olee ihe ụfọdụ dị mma e ji atụrụ ndụ n’ebe unu bi?