Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NDỊ GALESHIA 4–6

Otu ‘Ihe Ngosi Bụ́ Ihe Atụ’ nke Nwere Ihe Ọ Ga-akụziri Anyị

Otu ‘Ihe Ngosi Bụ́ Ihe Atụ’ nke Nwere Ihe Ọ Ga-akụziri Anyị

4:24-31

Pọl onyeozi ji ‘ihe ngosi a bụ́ ihe atụ’ kọwaa otú ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ si ka ọgbụgba ndụ Iwu ahụ mma. Mgbe Kraịst na ndị ya na ya ga-eso achị ga-achịwa ụwa, ụmụ mmadụ ga-ezu okè. Mmehie, iru uju na ọnwụ agaghị adịkwa.​—Aịza. 25:​8, 9.

 

HEGA BỤ́ OHU NWAANYỊ

Mba Izrel nke nọ n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu, nke isi obodo ya bụ Jeruselem

SERA BỤ́ NWAANYỊ NWEERE ONWE YA

Jeruselem nke dị n’elu, ya bụ, nzukọ Chineke nke dị n’eluigwe

“ỤMỤ” HEGA

Ndị Juu (ndị kwere Jehova nkwa na ha ga-edebe ọgbụgba ndụ Iwu ahụ) kpagburu Jizọs ma jụ ya

“ỤMỤ” SERA

Kraịst na 144,000 bụ́ Ndị Kraịst e tere mmanụ

NDỊ OHU NKE ỌGBỤGBA NDỤ IWU

Iwu ahụ chetaara mba Izrel na ha bụ ndị ohu nke mmehie

ỌGBỤGBA NDỤ ỌHỤRỤ MERE KA HA NWERE ONWE HA

Inwe okwukwe n’àjà mgbapụta Kraịst mere ka ụmụ Izrel gharazie ịnọ n’okpuru Iwu ahụ na-echetara ha na ha bụ ndị mmehie