Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Olee Ihe Ị Ga-amụta n’Aka Ndị Kraịst Ma nke A Na-akọ?

Olee Ihe Ị Ga-amụta n’Aka Ndị Kraịst Ma nke A Na-akọ?

N’ọgbakọ anyị dị iche iche, e nwere ndị jirila ọtụtụ afọ jeere Jehova ozi. Anyị nwere ike isi n’aka ha mụta ịtụkwasị Jehova obi. Anyị nwere ike ịgwa ha ka ha kọọrọ anyị gbasara nzukọ Jehova na nsogbu ndị ha nwerela nakwa otú Jehova si nyere ha aka imeri ha. Anyị nwedịrị ike ịkpọ otu n’ime ha gbaa ya ajụjụ ọnụ n’Ofufe Ezinụlọ anyị.

Ọ bụrụ na ị bụ onye Kraịst nọterela aka n’ọgbakọ, jiri obi gị niile kọọrọ ndị na-eto eto banyere okwukwe gị. Jekọb na Josef kọọrọ ụmụ ha ihe ndị ha mụtara banyere Jehova. (Jen. 48:21, 22; 50:24, 25) Ka oge na-aga, Jehova gwara ndị isi ezinụlọ ka ha na-akọrọ ụmụ ha banyere ọrụ ndị dị ebube ọ rụrụ. (Diut. 4:9, 10; Ọma 78:4-7) N’oge anyị a, ndị nne na nna na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ kwesịrị ịna-akọrọ ndị na-eto eto ọmarịcha ihe ndị ha hụrụ Jehova ji nzukọ ya rụzuo.

LEENỤ VIDIO BỤ́ ỊNỌGIDE NA-ADỊ N’OTU MGBE A MACHIRI ỌRỤ ANYỊ IWU, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee otú alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Ọstria si nyere ụmụnna anyị aka n’obodo ụfọdụ a machibidoro ọrụ anyị iwu?

  • Olee otú ụmụnna anyị ndị nọ n’obodo ndị a si mee ka okwukwe ha sie ike?

  • Gịnị mere ọtụtụ ndị nkwusa nọ na Romenia ji hapụ ọgbakọ Jehova, oleekwa otú ha si lọghachi?

  • Olee otú akụkọ ndị a si eme ka okwukwe gị sikwuo ike?

Mụta ihe ndị ga-eme ka okwukwe gị sie ike n’aka Ndị Kraịst ma nke a na-akọ n’ọgbakọ