Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe I Nwere Ike Ikwu

Ihe I Nwere Ike Ikwu

ỤLỌ NCHE

Ajụjụ: Ì chetara ihe a e kwuru n’amaokwu Baịbụl a anyị ga-agụ?

Amaokwu Baịbụl: Jọn 3:16

Otú a ga-esi enye ya: Ụlọ Nche a kọwara otú ahụhụ Jizọs tara na ọnwụ ọ nwụrụ ga-esi baara gị uru.

ỤLỌ NCHE (peeji nke 16)

Ajụjụ: Legodị ajụjụ a dị ebe a na azịza ndị ha na ya so. [Gụpụta ajụjụ nke mbụ na azịza ndị dị n’okpuru ya.] Olee nke i chere bụ azịza ya?

Amaokwu Baịbụl: Mat. 4:1-4

Otú a ga-esi enye ya: Ebe ọ bụ na Ekwensu gwara Jizọs okwu mgbe ọ na-anwa ya, Ekwensu agaghị abụ ihe ọjọọ dị mmadụ n’obi. Olee ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru gbasara Ekwensu? Isiokwu a ga-akọwakwuru gị ha.

AKWỤKWỌ ỊKPỌ ÒKÙ

Otú a ga-esi enye ya: Anyị bịara ịgwa unu gbasara ihe dị mkpa anyị ga-eme n’abalị iri abụọ na atọ n’ọnwa Mach. [Nye onye ahụ otu akwụkwọ ịkpọ òkù.] N’ụbọchị ahụ, nde kwuru nde ndị mmadụ ga-agbakọ n’ebe dị iche iche icheta ọnwụ Jizọs Kraịst. A ga-eji Baịbụl kọwaara anyị uru ọnwụ Jizọs nwụrụ baara anyị. E dere ebe anyị ga-anọ eme ya na oge anyị ga-eme ya ná mpempe akwụkwọ a. Biko, gbalịa ka ị bịa.

DEE OTÚ ỌZỌ Ị GA-ESI JIRI OTU N’IME AKWỤKWỌ NDỊ A ZIE OZI ỌMA

Jiri aro ndị a dị́ ebe a dee otú ọzọ ị ga-achọ isi jiri akwụkwọ ndị a zie ozi ọma.