Mach 14-20
JOB 1-5
Abụ nke 89 na Ekpere
Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Job Guzosiri Ike Mgbe Ọnwụnwa Bịaara Ya”: (Nkeji 10)
[Kpọnye vidio bụ́ Ihe Akwụkwọ Job Na-ekwu.]
Job 1:8-11—Setan kwuru na ihe mere Job ji na-erubere Chineke isi bụ n’ihi ihe ọ na-erite n’aka ya (w11 5/15 17 ¶6-8; w09 4/15 3 ¶3-4)
Job 2:2-5—Setan kwukwara na ọ bụrụ na ihe esiere onye ọ bụla na-erubere Chineke isi ike, ọ gbakụta ya azụ (w09 4/15 4 ¶6)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)
Job 1:6; 2:1—Olee ndị e kwere ka ha guzoro n’ihu Jehova? (w06 3/15 13 ¶6)
Job 4:7, 18, 19—Olee ụgha Elifaz ghaara Job? (w14 3/15 13 ¶3; w05 9/15 26 ¶4-5; w95 2/15 27 ¶5-6)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova?
Olee ihe ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a nke ị ga-eji zie ndị mmadụ ozi ọma?
Ọgụgụ Baịbụl: Job 4:1-21 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Ozi Ụlọ n’Ụlọ: Isiokwu Ụlọ Nche Nke 2 2016. Gwa onye ahụ ihe unu ga-atụle n’oge ọzọ. (Nkeji 2 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nletaghachi: Isiokwu Ụlọ Nche Nke 2 2016. Gwakwa ya ihe unu ga-atụle n’oge ọzọ. (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Ọmụmụ Baịbụl: fg isi nke 2 ¶2-3 (Nkeji 6 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ekwela Ka Ndị Ọgbọ Gị Rafuo Gị: (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio a dị́ na jw.org/ig. (Gaa n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI pịa NDỊ NA-ETO ETO.) E kirichaa ya, jụọ ajụjụ ndị a: Olee nsogbu ụmụaka na-enwe n’ụlọ akwụkwọ? Olee otú ha ga-esi eme ihe dị́ n’Ọpụpụ 23:2? Olee ihe anọ ga-enyere ha aka ka ha ghara ịna-eme ka ụmụ akwụkwọ ibe ha? Gwa ndị na-eto eto ka ha kọọ ahụmahụ ndị dị mma ha nwerela.
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: ia isi nke 11 ¶1-11 (Nkeji 30)
Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)
Abụ nke 149 na Ekpere