Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOB 1-5

Job Guzosiri Ike Mgbe Ọnwụnwa Bịaara Ya

Job Guzosiri Ike Mgbe Ọnwụnwa Bịaara Ya

Job bi na Ọz mgbe ndị Izrel nọ n’Ijipt na-agba ohu. Ọ bụghị onye Izrel, ma, ọ na-efe Jehova, na-erubekwara ya isi. Ọ mụrụ ọtụtụ ụmụ, nwee ọtụtụ akụnụba, a makwa ya ama n’obodo ya. Ndị mmadụ na-ejikarị ndụmọdụ o nyere ha akpọrọ ihe. Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi. Ọ na-enyekwara ndị ogbenye aka.

Job gosiri na ihe ka ya mkpa ná ndụ bụ irubere Jehova isi

1:8-11, 22; 2:2-5

  • Setan ma na Job na-erubere Chineke isi. Ma, o kwuru na ihe mere o ji erubere ya isi bụ maka na Chineke gọziri ya

  • Setan kwuru na ihe mere Job ji na-efe Jehova bụ maka ihe ọ na-erite n’aka ya

  • Jehova hapụrụ Setan ka ọ nwaa Job ka a mata nke bụ́ eziokwu. Setan lara ihe niile Job nwere n’iyi, gbuokwa ụmụ ya

  • Mgbe ọ hụrụ na Job ka nwere okwukwe n’ebe Chineke nọ, o kwuziri na onye ọ bụla na-erubere Chineke isi ga-akwụsị irubere ya isi ma ihe siere ya ike

  • Job emehieghị, o kwujọghịkwa Chineke