Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOB 6-10

Job Kwuru Ihe Gosiri na Obi Adịghị Ya Mma

Job Kwuru Ihe Gosiri na Obi Adịghị Ya Mma

Ekwensu lara akụnụba Job n’iyi, gbuo ụmụ ya, tiekwa ya ajọ ọrịa. Ma, ọ nọgidere na-erubere Chineke isi. Setan meziri ka ọ daa mbà n’obi ka o wee nupụrụ Chineke isi. Ndị enyi Job bịakwutere ya na-eme ka à ga-asị na ihe mere ya na-ewute ha. Ha atọ nọ na-ele Job n’anya ruo ụbọchị asaa n’akasighị ya obi. Mgbe ha mechaziri kwuo okwu, ha katọrọ ya, bokwa ya ebubo dị iche iche.

Job guzosiri ike n’agbanyeghị ọnwụnwa niile bịaara ya

6:3; 7:16; 9:20-22; 10:1, 12

  • Otú obi si jọọ Job njọ mere ka o chewe ihe na-ezighị ezi. O chere na Chineke achọghịdị ịma ma ọ̀ na-erubere ya isi

  • Obi ọjọọ ahụ mekwara ka ọ ghara iche na a ga-enwerịrị ihe mere o ji nọrọ n’ụdị ọnọdụ ahụ

  • N’agbanyeghị na Job na ahụhụ nọ na-alụ, o mere ka ndị enyi ya ahụ mara na ya ka hụrụ Jehova n’anya