Obi Siri Job Ike na A Ga-akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ
Job kwuru ihe gosiri na obi siri ya ike na Chineke ga-akpọlite ya n’ọnwụ ma ya nwụọ
-
Job ji osisi kọwaa ihe mere obi ji sie ya ike na Chineke ga-akpọlite ya n’ọnwụ ma ya nwụọ. Ọ ga-abụ na ọ bụ osisi oliv ka o bu n’obi mee ihe atụ ahụ
-
Otú mgbọrọgwụ osisi oliv si abami n’ime ala na-eme ka úkwù ya pulite ome ma e gbutuo ya. Mgbọrọgwụ ya dịrịhaala ndụ, ọ ga-eto ọzọ
-
A sịgodị na úkwù osisi oliv kpọrọ nkụ n’oge oké ọkọchị, mmiri zoo, ọ ga-epu ome, malitekwa ịwa alaka