Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ọnwụ Jizọs Mere Ka Mbilite n’Ọnwụ Nwee Isi

Ọnwụ Jizọs Mere Ka Mbilite n’Ọnwụ Nwee Isi

O nwere ọtụtụ ihe ọma Chineke ga-emere anyị n’ọdịnihu, ndị ọnwụ Jizọs mere ka ha nwee isi. Anyị na-echetakarị ihe ọma ndị ahụ n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs. Otu n’ime ha bụ mbilite n’ọnwụ. Jehova ekeghị ndị mmadụ ka ha na-anwụ anwụ. Ọ bụ ya mere o ji ewutekarị anyị ma onye nke anyị nwụọ. (1 Kọr. 15:26) O wutere Jizọs mgbe ndị na-eso ụzọ ya na-eru uju mgbe Lazarọs nwụrụ. (Jọn 11:33-35) Jizọs yiri nna ya bụ́ Jehova n’ihe niile. N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na uju anyị na-eru ma onye nke anyị nwụọ na-ewute Jehova. (Jọn 14:7) Ọ na-agụsi Jehova agụụ ike ka oge ọ ga-akpọlite ndị ohu ya nwụrụ anwụ mee ruwe eru. Anyịnwa kwesịkwara ịna-atụsi anya oge ahụ ike.—Job 14:14, 15.

Jehova na-eme ihe ya n’usoro. N’ihi ya, obi siri anyị ike na ọ ga-ahazi otú ọ ga-esi kpọlite ndị nwụrụ anwụ. (1 Kọr. 14:33, 40) Ndị mmadụ ga na-anabata ndị nwụrụ anwụ kama ịgbakọ na-eli ozu. Ị̀ na-echeta mbilite n’ọnwụ, nke ka nke ma onye nke gị nwụọ, wee kwe ka ọ kasie gị obi? (2 Kọr. 4:17, 18) Ị̀ na-ekele Jehova maka otú o si jiri Jizọs gbapụta anyị, jirikwa Baịbụl mee ka anyị mata na ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ?—Kọl. 3:15.

  • Olee ndị enyi gị ma ọ bụ ndị ikwu gị nwụrụ anwụ ị na-atụ anya ịhụ ọzọ?

  • Olee ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl ị ga-achọ ịgakwuru ka gị na kpaa nkata?