Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-EMEKWU NKE ỌMA N’OZI ỌMA

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma—Kwadebe Otú Ị Ga-esi Nye Mmadụ Magazin

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma—Kwadebe Otú Ị Ga-esi Nye Mmadụ Magazin

IHE MERE O JI DỊ MKPA: Ihe na-adị n’ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu” na-enyere anyị aka ịma otú dị mfe anyị ga-esi enye mmadụ magazin. Ma, ọ pụtaghị na anyị ga-ekwurịrị ya otú ahụ e si dee ya. Anyị nwere ike isi otú ọzọ jiri isiokwu ahụ nye mmadụ magazin ahụ. O nwekwara ike ịbụ na o nwere isiokwu ọzọ dị na ya nke ga-aka abara ndị nọ́ n’ókèala anyị uru. Ọ bụrụ otú ahụ, ị gụchaa ya, tụlee aro ndị ahụ e dere ede, kiriekwa vidio ndị kọwara otú anyị ga-esi nye ndị mmadụ magazin, jirizie ihe ndị ị mụtara kwadebe otú ị ga-esi enye mmadụ magazin ahụ.

IHE Ị GA-EME:

Jụọ onwe gị, sị: ‘Ọ̀ bụ aro ndị e dere ede ka m chọrọ iji zie ozi ọma?’

EE

  • Kwadebe ihe mbụ ị ga-ekwu. I kelechaa onye ị chọrọ izi ozi ọma, kwuo ihe mere i ji chọta ya ná nkenke. (Dị ka ihe atụ: “Ihe mere m ji bịa bụ . . .”)

  • Kwadebe otú ị ga-esi ejikọ ma ajụjụ ị ga-ajụ onye ahụ, ma amaokwu Baịbụl ị ga-agụrụ ya, ma ihe ị ga-ekwu tupu gị enye ya magazin ahụ. (Dị ka ihe atụ: Tupu ị gụọ amaokwu Baịbụl, i nwere ike ịsị: “Ebe a anyị ga-agụ na Baịbụl ga-eme ka azịza ajụjụ a doo gị anya.”)

EE E

  • Họrọ otu isiokwu masịrị gị na magazin ahụ ị ma ga-aka abara ndị ókèala unu uru

  • Chepụta ajụjụ ị ga-ajụ onye ị chọrọ inye ya. Ajụjụ ahụ kwesịrị ịbụ nke ga-eme ka onye ahụ chee echiche ma kwuo uche ya, ọ bụghị nke ga-emenye ya ihere. (Dị ka ihe atụ: I nwere ike ịjụ ya ajụjụ na-adị na peeji nke abụọ na magazin.)

  • Họrọ amaokwu Baịbụl ị ga-agụ. (Ọ bụrụ na ọ bụ Teta! ka ị chọrọ inye mmadụ, ọ bụghị iwu na ị ga-agụrụ ya Baịbụl, n’ihi na ndị e bu n’obi ebipụta ya bụ ndị na-amachaghị gbasara Baịbụl. O nwedịrị ike ịbụ na o nweghị ihe ụdị ndị ahụ ji ikpere Chineke kpọrọ.)

  • Chepụta otu ahịrịokwu ma ọ bụ ahịrịokwu abụọ ị ga-eji kọwaara onye ahụ otú isiokwu ahụ dị́ na magazin ahụ ga-esi baara ya uru

NKE Ọ BỤLA Ọ BỤ

  • Kwadebe ajụjụ ị ga-atọgbọrọ ya ma gwa ya na ị ga-aza ya ma ị bịa n’oge ọzọ

  • Dee ihe ndị ahụ unu ga-ekwurịta ede ka ị nwee ike icheta ihe ndị ị ga-agwa ya ma ị gaghachi