Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ESTA 6-10

Esta Gbachiteere Jehova na Ndị Na-efe Ya

Esta Gbachiteere Jehova na Ndị Na-efe Ya

Esta achọghị naanị ọdịmma ya, kama, o ji obi ike gbachitere Jehova na ndị Juu ibe ya

8:3-5, 9

  • Ihe dịịrị Esta na Mọdekaị mma. Ma, a ka na-ezigara ndị Juu bi n’ebe niile eze Ahazuirọs na-achị akwụkwọ ozi Heman dere, nke kwuru na a ga-egbu ha niile

  • Esta gakwara n’ihu eze ọzọ mgbe eze na-akpọghị ya n’agbanyeghị na ọ ma na e nwere ike igbu ya. O bere ákwá, rịọkwa eze ka ọ gbanwee iwu ahụ e tiri ka e gbuo ndị Juu niile

  • A naghị agbanwe iwu ọ bụla eze bịanyere aka na ya. N’ihi ya, eze nyere Esta na Mọdekaị ikike ka ha tie iwu ọhụrụ

Jehova mere ka ndị ya merie

8:10-14, 17

  • Egwú dagharịrị, e zizie ndị Juu ozi ka ha jikere ịlụso ndị ọ bụla chọrọ igbu ha ọgụ

  • Ndị na-agba ịnyịnya gazuru ebe niile eze na-achị zie ndị Juu ozi ahụ, ha jikekwaara agha

  • Ọtụtụ ndị hụrụ ihe gosiri na Chineke nọnyeere ndị Juu. Ha sonyekwaara ha na-efe Chineke